Levitikọs 23:39-43 Bible Nso (IGBOB)

39. Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa ahu, mb͕e unu chikọtasiri ihe-ọmume nke ala ahu, unu gēme ememe Jehova ubọchi asa: n'ubọchi mbu idebe-ubọchi-izu-ike gādi, n'ubọchi nke-asatọ idebe-ubọchi-izu-ike gādi kwa.

40. Unu gāchiri kwa n'onwe-unu n'ubọchi mbu nkpuru nke osisi ọma, na igu nkwu, na alaka osisi b͕ara ọhia, na osisi willow nke miri-iyi; unu gaṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi asa.

41. Unu gēme kwa ya dika ememe emere Jehova ubọchi asa n'arọ: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile: n'ọnwa nke-asa ka unu gēme ya.

42. N'ulo-ntu ka unu gēbi ubọchi asa; ndi nile amuru n'ala n'Israel gēbi n'ulo-ntu:

43. ka ọb͕ọ-unu nile we mara na ọ bu n'ulo-ntu ka M'mere umu Israel ka ha biri, mb͕e M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

Levitikọs 23