23. Jehova we gwa Moses okwu, si,
24. Gwa umu Israel okwu, si, N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, idebe-ubọchi-izu-ike gādiri unu, ncheta nke uda-opì nādasi ike, nkpọkọta nsọ.
25. Ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova.
26. Jehova we gwa Moses okwu, si,
27. Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka ka ubọchi nkpuchi-nmehie gādi: nkpọkọta nsọ ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova.
28. Ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje n'otu ubọchi ahu: n'ihi na ubọchi nkpuchi-nmehie ka ọ bu, ikpuchiri unu nmehie-unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu.