5. Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà nké àjà-udo, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.
6. N'ubọchi unu churu ya ka agēri ya, ya na echi-ya: ma nke fọduru rue ubọchi nke-atọ, n'ọku ka agēsure ya.
7. Ma ọ buru na erie ya ma-ọli n'ubọchi nke-atọ, ihe-árú ka ọ bu; ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ:
8. ma onye nēri ya gēbu ajọ omume-ya, n'ihi na ihe nsọ nke Jehova ka o meworo ka ọ ghara idi nsọ: aga ebipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya.
9. Ma mb͕e unu nēwe ihe-ubi nke ala-unu, ewesila ihe di n'akuku ubi-gi, achikọta-kwa-la ihe-nchikọta nke owuwe-ihe-ubi-gi fọduru