Levitikọs 19:19-27 Bible Nso (IGBOB)

19. Unu gēdebe ukpurum nile. Emela ka anu-ulo-gi di iche iche nāb͕a onwe-ha: aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-gi: uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta agaghi-abia n'aru-gi.

20. Ma mb͕e nwoke soro nwayi dina ka ọ ra aru n'aru-ya, ma nwayi ahu bu nwayi nēje ozi, nke nwoke kwere ilu, nke anāb͕aputaghi ma-ọli, nke anēmeghi kwa ka ọ nwere onwe-ya: nchọputa okwu ahu gādi; agaghi-eme ka ha nwua, n'ihi na emeghi ka nwayi ahu nwere onwe-ya.

21. O gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, bú ebulu ibu àjà-ikpe-ọmuma.

22. Onye-nchu-àjà gēwere kwa ebulu àjà-ikpe-ọmuma ahu kpuchiri ya nmehie-ya n'iru Jehova bayere nmehie-ya nke o mehieworo: agāb͕aghara kwa ya nmehie-ya nke o mehieworo.

23. Ma mb͕e unu gābà n'ala ahu, mb͕e unu gākuwori osisi nile ọ bula ibu ihe-oriri, unu gāgu kwa nkpuru-ya n'ebighi-úgwù-ya: arọ atọ ka ọ gāburu unu ihe anēbighi úgwù; agaghi-eri ya.

24. Ma n'arọ nke-anọ nkpuru-ya nile gādi nsọ, otuto anēto Jehova.

25. Ma n'arọ nke-ise unu gēri nkpuru-ya, ka ọ we mikwasiri unu ihe ọmume-ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

26. Unu erila ihe ọ bula ya na ọbara-ya: unu ab͕ala afa, unu eji-kwa-la igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ.

27. Unu akọpula usọ isi-unu buruburu, ebibi-kwa-la usọ afu-ọnu-gi.

Levitikọs 19