Levitikọs 18:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

3. Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile ha.

4. Ikpém nile ka unu gēme, ọ bu kwa ukpurum nile ka unu gēdebe, ijeghari nime ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

5. Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile: nke madu gēme, di ndu nime ha: Mu onwem bu Jehova.

6. Nwoke ọ bula abiarula nso onye-aru-ya ọ bula, ikpughe ọtọ-ya: Mu onwem bu Jehova.

7. Ekpughela ọtọ nna-gi, bú ọtọ nne-gi: nne-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya.

Levitikọs 18