4. onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ewere nnunu abua di ndu di kwa ọcha, na osisi cedar, na ogho uhie, na hyssop, bayere onye anēme ka ọ di ọcha:
5. onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka eb͕ue otù nime nnunu ahu nime ihe ájá n'elu miri nērù erù:
6. nnunu ahu nke di ndu, o gēwere ya, na osisi cedar ahu, na ogho uhie ahu, na hyssop ahu, sue ha na nnunu ahu di ndu n'ọbara nnunu ahu eb͕uru n'elu miri nērù erù: