Levitikọs 14:25-29 Bible Nso (IGBOB)

25. o gēb͕u kwa nwa-aturu àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu, tiye ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya:

26. ọ bu kwa ufọdu nime manu ahu ka onye-nchu-aja gāwusi n'ọbu-aka-ekpe onye-nchu-aja ahu:

27. onye-nchu-aja gēwere kwa nkpisi-aka-nri-ya fesa ufọdu nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya ub͕ò asa n'iru Jehova:

28. onye-nchu-aja gētiye kwa ufọdu nime manu nke di n'ọbu-aka-ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n'elu ebe ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu:

29. ma nke fọduru nime manu nke di n'ọbu-aka onye-nchu-aja, o gētiye ya n'elu isi onye anēme ka ọ di ọcha, ikpuchiri ya nmehie-ya n'iru Jehova.

Levitikọs 14