Levitikọs 14:16-26 Bible Nso (IGBOB)

16. onye-nchu-àjà gēdeye kwa nkpisi-aka-nri-ya nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya, ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime manu ahu ub͕ò asa n'iru Jehova:

17. ufọdu nime manu nke fọduru n'ọbu-aka-ya ka onye-nchu-àjà gētiye kwa n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye ahu anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n'elu ọbara àjà-ikpe-ọmuma:

18. ma manu nke fọduru n'ọbu-aka nke onye-nchu-àjà, o gētiye ya n'isi onye anēme ka ọ di ọcha: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova.

19. Onye-nchu-àjà gēme kwa àjà-nmehie, kpuchiere ya nmehie-ya, bú onye anēme ka o si n'ọrurú-ya di ọcha; emesia o gēb͕u kwa àjà-nsure-ọku:

20. onye-nchu-àjà gēsure kwa àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'ebe-ichu-aja: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, ọ gādi kwa ọcha.

21. Ma ọ buru na ob͕eye ka ọ bu, nke aka-ya nērughi kwa ya, o gēwere kwa otù nwa-ebulu ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma ibu àjà-ofufè, ikpuchiri ya nmehie-ya, na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara manu ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, na otù log nke manu;

22. na nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, nke aka-ya ruru; otù gābu kwa àjà-nmehie, ibe-ya gābu àjà-nsure-ọku.

23. Ọ gēweta-kwa-ra ha onye-nchu-aja n'ubọchi nke-asatọ ime ka ọ di ọcha, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, n'iru Jehova.

24. Onye-nchu-aja gēwere kwa nwa-aturu ahu nke àjà-ikpe-ọmuma, na log manu ahu, onye-nchu-aja gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova:

25. o gēb͕u kwa nwa-aturu àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu, tiye ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya:

26. ọ bu kwa ufọdu nime manu ahu ka onye-nchu-aja gāwusi n'ọbu-aka-ekpe onye-nchu-aja ahu:

Levitikọs 14