Levitikọs 13:6-10 Bible Nso (IGBOB)

6. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa ọzọ: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha; ọnyá efu ka ọ bu; ọ gāsu kwa uwe-ya, di ọcha.

7. Ma ọ buru na ọnya ahu aba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e emesiri ka onye-nchu-àjà hu ya ime ka ọ di ọcha, ọ gēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya nke ub͕ò abua:

8. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọnyá ahu abawo aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ ruru árú: ekpenta ka ọ bu.

9. Mb͕e ihe-otiti ekpenta di n'aru madu, agēme kwa ka ọ biakute onye-nchu-àjà;

10. onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na ihe-otutó ọcha di n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ihe ahu emewo aji ka ọ b͕anwe ọcha, onyá nke anu-aru ndu adi kwa n'ihe-otutó ahu,

Levitikọs 13