43. Onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ihe-otutó nke ihe-otiti ahu di ọcha nācha ọbara-ọbara n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, dika ekpenta nke akpukpọ anu-aru si di, n'ile ya anya;
44. onye-ekpenta ka ọ bu, ihe ruru árú ka ọ bu: onye-nchu-àjà aghaghi isi na ọ ruru árú; n'isi-ya ka ihe-otiti-ya di.
45. Ma onye-ekpenta, nke ihe-otiti ahu di n'aru ya, uwe-ya nile gābu ihe dọwara adọwa, agiri-isi-ya ganātọpu kwa atọpu, o gēkpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ya nke-elu, nākpọ, si, Onye ruru árú, onye ruru árú.
46. Ubọchi nile nke ihe-otiti ahu di n'aru ya ka ọ gāru árú; onye ruru árú ka ọ bu: ọ gēbi iche; n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka ebe-obibi-ya gābu.
47. Uwe kwa, mb͕e ihe-otiti ekpenta di nime ya, ma ọ bu uwe aji-anu, ma-ọbu uwe flax;