Levitikọs 13:38-43 Bible Nso (IGBOB)

38. Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ntupọ di iche iche nke nēke uke, bú ntupọ nēke uke nke di ọcha, di n'akpukpọ anu-aru-ha;

39. onye-nchu-àjà gāhu kwa: ma, le, ọ buru na ntupọ di iche iche nke nēke uke acha ọcha inyoghi-inyoghi, bú nke di n'akpukpọ anu-aru-ha; ngwọ ka ọ bu, ọ b͕awa-putawo n'akpukpọ-aru-ya; ocha ka ọ di.

40. Ma onye ọ bula, mb͕e agiri-isi kwọchapuworo n'isi-ya, onye-isi-nkwọcha ka ọ bu; ọcha ka ọ di.

41. Ọ buru kwa na agiri-isi-ya akwọchapuwo n'isi-ya na nko iru-ya, onye egedege-iru-ya kwọchara akwọcha ka ọ bu: ọcha ka ọ di.

42. Ma mb͕e ihe-otiti nke di ọcha nācha ọbara di n'isi-nkwọcha ahu ma-ọbu n'egedege-iru ahu kwọchara akwọcha; ekpenta nke nāb͕awaputa n'isi-nkwọcha-ya, ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, ka ọ bu.

43. Onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ihe-otutó nke ihe-otiti ahu di ọcha nācha ọbara-ọbara n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, dika ekpenta nke akpukpọ anu-aru si di, n'ile ya anya;

Levitikọs 13