Levitikọs 12:6-7 Bible Nso (IGBOB)

6. N'ozuzù ubọchi nile nke ime ya ka ọ di ọcha bayere nwa-nwoke, ma-ọbu bayere nwa-nwayi, ọ gēwetara onye-nchu-àjà nwa-aturu nke b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku, na nwa-kpalakwu-kwu, ma-ọbu nduru, ka ọ buru àjà-nmehie, rue ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute:

7. ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; agēme kwa ya ka ọ di ọcha site n'isi ọbara-ya. Nka bu iwu nke nwayi nke nāmu nwa, ma ọ bu nwoke ma-ọbu nwayi.

Levitikọs 12