Levitikọs 11:40-45 Bible Nso (IGBOB)

40. Onye nēri ufọdu nime ozu-ya gāsu uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: onye ahu nke nēbu ozu-ya gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi.

41. Ọzọ ihe ọ bula nke nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, ihe-árú ka ọ bu; agaghi-eri ya.

42. Ihe ọ bula nke nēje ije n'afọ-ya, na ihe ọ bula nke nēje ije n'ukwu anọ, ma-ọbu ihe ọ bula nwere ọtutu ukwu, ọbuná ihe nile nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, unu erila ha; n'ihi na ihe ruru árú ka ha bu.

43. Unu ejila ihe-nnuputa ọ bula nke nēnuputa enuputa me onwe-unu ka unu buru ihe-árú, unu eji-kwa-la ha meru onwe-unu, ewe were ha meru unu.

44. N'ihi na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu: unu gēdo kwa onwe-unu nsọ, we di nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di: unu eji-kwa-la ihe-nnuputa ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa meru onwe-unu.

45. N'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, iburu unu Chineke: unu gādi kwa nsọ, n'ihi na nsọ ka Mu onwem di.

Levitikọs 11