33. Ihe ájá ọ bula nke otù nime ha gādabà nime ya, ihe ọ bula nke di nime ya gāru árú, ihe ájá ahu ka unu gētiwa kwa.
34. Nime ihe-oriri nile nke anēri, nke ahu nke miri di otú a gābiakwasi gāru árú: ihe-ọṅuṅu nile nke anāṅu nime ihe ọ bula di otú a gāru kwa árú.
35. Ihe ọ bula nke ihe si n'ozu-ha gādakwasi gāru kwa árú; ma ọ bu ite-ọku, ma-ọbu ekwu, agākwatu ya: ihe ruru árú ka ha bu, ihe ruru árú ka ba gābu-kwa-ra unu.
36. Ma otú ọ di, isi-iyi ma-ọbu olùlù-miri, bú nchikọta miri, gādi ọcha: ma onye nēmetu ozu-ha aka gāru árú.
37. Ma mb͕e ihe nke si n'ozu-ha gādakwasi nkpuru-ọghigha ọ bula nke anāgha agha, ihe di ọcha ka ọ bu.
38. Ma mb͕e agētiye miri n'elu nkpuru-ọghigha, ma ihe si n'ozu-ha adakwasi ya, ihe ruru árú ka ọ buru unu.
39. Ọzọ, mb͕e otù nime anumanu, nke buru unu ihe-oriri, gānwu; onye nēmetu ozu-ya aka gāru árú rue anyasi.
40. Onye nēri ufọdu nime ozu-ya gāsu uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: onye ahu nke nēbu ozu-ya gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi.