Levitikọs 11:24-32 Bible Nso (IGBOB)

24. N'ihi ihe ndia ka unu gēme onwe-unu ndi ruru árú: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi:

25. onye ọ bula nke nēbu ihe sitere n'ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

26. Anumanu ọ bula nke bu ihe ukwu-ya wara njakpa, ma ọ bughi ihe ukwu-ya warara awara, ọ bughi kwa ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ha aka gāru árú.

27. Ihe ọ bula kwa nke nēje ije n'ọbu-aka-ya, n'etiti anu nile di ndu nke nēje ije n'ukwu anọ, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi.

28. Onye nēbu ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ihe ruru árú ka ha buru unu.

29. Ndia bu-kwa-ra unu ihe ruru árú n'etiti ihe nēnuputa enuputa, nke nēnuputa n'elu uwa: weasel, na oké, na agu-iyi di iche iche,

30. na ọba-miri, na ngwere-aghu, na ngwere, na ngwere-uzuzu, na owumagana.

31. Ndia buru unu ihe ruru árú n'etiti ihe nile nēnuputa enuputa: onye ọ bula nke nēmetu ha aka mb͕e ha nwuru anwu gāru árú rue anyasi.

32. Ihe ọ bula nke otù nime ha gādakwasi, mb͕e ha nwuru, ọ gāru kwa árú: ma ọ bu ihe osisi ọ bula, ma-ọbu uwe, ma-ọbu akpukpọ, ma-ọbu àkpà, ihe ọ bula nke eji ya eje ozi ọ bula, agētiye ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi; o we di ọcha.

Levitikọs 11