18. na okwukwu nwere mpi, na okwolo, na udele;
19. na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu.
20. Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, nke nēje ije n'ukwu anọ, ihe-árú ka ọ buru unu.
21. Ma otú ọ di, ndia ka unu gēri n'etiti anu-ufe nile nēnuputa enuputa, nke nēje ije n'ukwu anọ, nke nwere ogwe-ukwu n'elu ukwu-ala-ha, iji nākwu ntù n'elu ala;
22. ndia ka unu gēri n'etiti ha; igurube di iche iche, na akpa-nkwu di iche iche, na nbuzu di iche iche, na ogugu di iche iche.
23. Ma anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, nke nwere ukwu anọ, ihe-árú ka ọ buru unu.
24. N'ihi ihe ndia ka unu gēme onwe-unu ndi ruru árú: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi:
25. onye ọ bula nke nēbu ihe sitere n'ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
26. Anumanu ọ bula nke bu ihe ukwu-ya wara njakpa, ma ọ bughi ihe ukwu-ya warara awara, ọ bughi kwa ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ha aka gāru árú.
27. Ihe ọ bula kwa nke nēje ije n'ọbu-aka-ya, n'etiti anu nile di ndu nke nēje ije n'ukwu anọ, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi.
28. Onye nēbu ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ihe ruru árú ka ha buru unu.
29. Ndia bu-kwa-ra unu ihe ruru árú n'etiti ihe nēnuputa enuputa, nke nēnuputa n'elu uwa: weasel, na oké, na agu-iyi di iche iche,
30. na ọba-miri, na ngwere-aghu, na ngwere, na ngwere-uzuzu, na owumagana.
31. Ndia buru unu ihe ruru árú n'etiti ihe nile nēnuputa enuputa: onye ọ bula nke nēmetu ha aka mb͕e ha nwuru anwu gāru árú rue anyasi.
32. Ihe ọ bula nke otù nime ha gādakwasi, mb͕e ha nwuru, ọ gāru kwa árú: ma ọ bu ihe osisi ọ bula, ma-ọbu uwe, ma-ọbu akpukpọ, ma-ọbu àkpà, ihe ọ bula nke eji ya eje ozi ọ bula, agētiye ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi; o we di ọcha.
33. Ihe ájá ọ bula nke otù nime ha gādabà nime ya, ihe ọ bula nke di nime ya gāru árú, ihe ájá ahu ka unu gētiwa kwa.
34. Nime ihe-oriri nile nke anēri, nke ahu nke miri di otú a gābiakwasi gāru árú: ihe-ọṅuṅu nile nke anāṅu nime ihe ọ bula di otú a gāru kwa árú.
35. Ihe ọ bula nke ihe si n'ozu-ha gādakwasi gāru kwa árú; ma ọ bu ite-ọku, ma-ọbu ekwu, agākwatu ya: ihe ruru árú ka ha bu, ihe ruru árú ka ba gābu-kwa-ra unu.
36. Ma otú ọ di, isi-iyi ma-ọbu olùlù-miri, bú nchikọta miri, gādi ọcha: ma onye nēmetu ozu-ha aka gāru árú.
37. Ma mb͕e ihe nke si n'ozu-ha gādakwasi nkpuru-ọghigha ọ bula nke anāgha agha, ihe di ọcha ka ọ bu.