14. na ndab͕u, na agu-nkwọ di iche iche;
15. ugolo-ọma ọ bula di iche iche;
16. na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche;
17. na okwukwu ntà, na cormorant, na okwukwu oku;
18. na okwukwu nwere mpi, na okwolo, na udele;
19. na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu.
20. Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, nke nēje ije n'ukwu anọ, ihe-árú ka ọ buru unu.
21. Ma otú ọ di, ndia ka unu gēri n'etiti anu-ufe nile nēnuputa enuputa, nke nēje ije n'ukwu anọ, nke nwere ogwe-ukwu n'elu ukwu-ala-ha, iji nākwu ntù n'elu ala;
22. ndia ka unu gēri n'etiti ha; igurube di iche iche, na akpa-nkwu di iche iche, na nbuzu di iche iche, na ogugu di iche iche.