1. Ma umu-ndikom Eron, bú Nedab na Abaihu, were ihe-igu-ọku, onye ọ bula ọ were nke ya, ha we tiye ọku nime ha, tukwasi ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya, we weta nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ, nke Ọ nēnyeghi ha n'iwu.
2. Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova.
3. Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti.
4. Moses we kpọ Mishael na Elzafan, bú umu-ndikom Uziel nwa-nne nna Eron, si ha, Biaruenu nso, si n'iru ebe nsọ a bupu umu-nne-unu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū.
5. Ha we biaru nso, buru ha n'uwe-ime-ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Moses kwuru.
6. Moses we si Eron, ọ si kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom, Unu akọpula agiri-isi-unu, unu adọwa-kwa-la uwe-unu; ka unu we ghara inwu, ka Ọ we ghara kwa iwe iwe megide nzukọ Israel nile: ma ka umu-nne-unu, bu ulo nile nke Israel, kwara nsure-ọku ahu nke Jehova sureworo akwá.
7. Unu esi-kwa-la n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute pua, ka unu we ghara inwu: n'ihi na manu otite-manu nke Jehova dikwasi unu. Ha we me dika okwu Moses si di.
8. Jehova we gwa Eron okwu, si,
9. Aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom tiyere gi, mb͕e unu nābà n'ulo-ikwū nzute, ka unu we ghara inwu; ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile:
10. ka unu we kpa kwa ókè n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, na n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha;
11. ka unu we zí kwa umu Israel ukpuru nile nke Jehova gwaworo ha site n'aka Moses.
12. Moses we gwa Eron okwu, ọ gwa kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom fọduru, si, Werenu onyinye-inata-iru-ọma nke fọduru site n'àjà-ọku nke Jehova, rie ya n'ekoghi-eko na nso ebe-ichu-àjà: n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.