16. Ndia bu ndi-ntamu, ndi nāta Chineke uta, nējeso agu ihe ọjọ nile ha (ọnu-ha nēkwu kwa oké okwu nāfuli afuli), ndi nāja iru madu n'ihi urù.
17. Ma unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, chetanu okwu nile nke ndi-ozi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist buru uzọ kwu;
18. na ha siri unu, N'oge ikpe-azu ndi-ọchì gādi, nāga dika agu ihe ọjọ nile nke aka ha nke asọpughi-Chineke si di.
19. Ndia bu ndi nākpata nkewa, ndi nkpuru-obi madu nāchi, ndi nēnweghi Mọ Nsọ.