Joshua 8:3-14 Bible Nso (IGBOB)

3. Joshua we bilie, ya na ndi-agha nile, irigoru Ai: Joshua we rọputa orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ndikom iri-na-ise, ndi-dike, bú ndi-dìnkpà, o we zipu ha n'abali.

4. O we nye ha iwu, si, Lenu, unu onwe-unu nēru nbì megide obodo ahu, n'azu obodo: unu esila n'obodo ahu je n'ebe di anya nke-uku, buru-kwa-nu ndi nọ na njikere, unu nile:

5. mu onwem, na ndi nile mu na ha nọ, gābiaru obodo ahu nso: ọ gēru kwa, mb͕e ha gāputa izute ayi, dika na mb͕e mbu, na ayi gāb͕alaga n'iru ha;

6. ha gāputa n'azu ayi, rue mb͕e ayi gādọpu ha n'obodo; n'ihi na ha gāsi, Ha nāb͕alaga n'iru ayi, dika na mb͕e mbu; ayi gāb͕alaga kwa n'iru ha:

7. unu onwe-unu gēsi kwa n'oruru-nbì ahu bilie, nweta obodo ahu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, gēnye ya n'aka-unu.

8. Ọ gēru kwa, mb͕e unu wereworo obodo ahu, na unu gēsu obodo ahu ọku; dika okwu Jehova si di, otú a ka unu gēme: lenu, enyewom unu iwu.

9. Joshua we zipu ha: we je n'oruru-nbì ahu, we nọdu n'etiti Bet-el na Ai, n'akuku Ọdida-anyanwu Ai: Joshua we nọ ọnọdu-abali ahu n'etiti ndi Israel.

10. Joshua we bilie n'isi-ututu, lekọta ndi Israel, rigo, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel, n'iru ndi Israel, rue Ai.

11. Ndi nile, bú ndi-agha ndi ya na ha nọ, we rigo, biarue nso, bia na ncherita-iru obodo ahu, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Ugwu nke Ai: ma ndagwurugwu di n'etiti ya na Ai.

12. O we chiri ihe ra ka nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, do ha n'oruru-nbì n'etiti Bet-el na Ai, n'akuku Ọdida-anyanwu obodo ahu.

13. Ndi Israel we do ọmuma-ulo-ikwū ahu nile nke di n'akuku Ugwu obodo ahu, na ndi-ha ndi nēche anwu n'akuku Ọdida-anyanwu obodo ahu; Joshua we je n'etiti ndagwurugwu ahu n'abali ahu.

14. O rue, mb͕e eze Ai huru nke ahu, na ndikom obodo-ya mere ngwa, bilie n'isi-ututu, pua izute Israel ibu agha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, na mb͕e akara àkà, n'iru Araba ahu; ma ya onwe-ya amaghi na ndi nēru nbì di megide ya n'azu obodo-ya.

Joshua 8