1. O rue, mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan, na Jehova gwara Joshua okwu, si,
2. Werenu n'onwe-unu ndikom iri na abua sitere na ndim, otù nwoke otù nwoke n'ebo ọ bula,
3. nye-kwa-nu ha iwu, si, Bupuru onwe-unu n'ebe a, n'etiti Jọdan, n'ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà, nkume iri na abua, bubiga ha n'etiti unu, dọba ha n'ọnọdu-abali ahu, ebe unu gānọ abali ta.
4. Joshua we kpọ ndikom iri na abua ahu, ndi o doziworo site n'umu Israel, otù nwoke otù nwoke site n'ebo ọ bula: