10. ha we diri umu Eron, ndi sitere n'ab͕uru ndi Kohat, ndi sitere n'umu Livai: n'ihi na ha ka ife-nzà mbu diri.
11. Ha we nye ha Kiriat-aba, nna Anak ka Aba ahu bu, (nke ahu bu Hebron,) n'ugwu Juda, ya na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya.
12. Ma ọhia nke obodo ahu, na obodo ntà ya nile, ka ha nyere Keleb nwa Jefune n'ihe-onwunwe-ya.
13. Umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha nyere Hebron na ebe-ita-nri-ya, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Libna na ebe-ita-nri-ya nile;
14. na Jatia na ebe-ita-nri-ya nile, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile,
15. na Holon na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile;
16. na Ain na ebe-ita-nri-ya nile, na Juta na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile; obodo iteghete site n'ebo abua ahu.
17. Site kwa n'ebo Benjamin, Gibeon na ebe-ita-nri-ya nile, na Geba na ebe-ita-nri-ya nile;
18. na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile, na Almon na ebe-ita-nri-ya nile: obodo anọ.
19. Obodo nile nke umu Eron, bú ndi-nchu-àjà, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha.
20. Ab͕uru nile nke umu Kohat, bú ndi Livai, bú ndi fọduru site n'umu Kohat, ha nwere obodo ife-nzà-ha site n'ebo Efraim.
21. Ha we nye ha Shekem na ebe-ita-nri-ya nile n'ugwu Efraim, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Gezea na ebe-ita-nri-ya nile;
22. na Kibzaim na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.
23. Site kwa n'ebo Dan, Elteke na ebe-ita-nri-ya nile, na Gibeton na ebe-ita-nri-ya nile;
24. na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.
25. Site kwa na nkera ebo Manase, Tanak na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo abua.
26. Obodo nile di iri, ha na ebe-ita-nri-ha, bú nke diri ab͕uru umu Kohat fọduru.