Joshua 20:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Joshua okwu, si,

2. Gwa umu Israel okwu, si, Wezugara onwe-unu obodo nb͕abà ahu, nke M'gwara unu okwu bayere ha n'aka Moses:

3. ka ob͕u-madu onye nētib͕u madu n'ọghọm nāmaghi ama we b͕alaga n'ebe ahu: ha gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà ipu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara.

4. Ọ gāb͕alaga kwa n'otù nime obodo ahu, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo ahu, kwue okwu-ya nile na nti ndi-okenye obodo ahu; ha gākpọbata kwa ya n'obodo tiyere onwe-ha, nye ya ọnọdu, ka o we biri n'etiti ha.

Joshua 20