Joshua 19:5-22 Bible Nso (IGBOB)

5. na Ziklag, na Bet-makabot, na Haza-susa;

6. na Bet-lebaot, na Sharuhen; obodo iri na atọ na obodo ntà ha:

7. na Ain, na Rimon, na Eta, na Ashan; obodo anọ na obodo ntà ha:

8. na obodo ntà nile nke di obodo ndia buruburu rue Bealat-bia, bú Rema nke Negeb. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di.

9. Site n'òkè umu Juda ka ihe-nketa umu Simeon di: n'ihi na òkè umu Juda riri nne kari ha: umu Simeon we keta ihe n'etiti ihe-nketa-ha.

10. Ife-nzà nke-atọ we putara umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di: ókè-ala ihe-nketa-ha we di rue Sarid:

11. ókè-ala-ha we rigo n'akuku Ọdida-anyanwu, ru kwa Marala, we metu Dabeshet, metu kwa miri-iyi nke di n'iru Jọkneam;

12. o si na Sarid chigharia n'akuku Iru-anyanwu n'ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa; ọ pua rue Daberat, we rigo rue Jafia;

13. o si n'ebe ahu gabiga n'akuku Iru-anyanwu n'akuku ọwuwa-anyanwu rue Gat-hefa, rue Et-kazin; ọ pua na Rimon, nke akpara rue Nea;

14. ókè-ala ahu we b͕a ya buruburu n'Ugwu rue Hanaton: ọpupu-ya di kwa na ndagwurugwu Ifta-el;

15. na Katat, na Nahalal, na Shimron, na Idala, na Bet-lehem: obodo iri na abua na obodo ntà ha.

16. Nka bu ihe-nketa umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.

17. Ife-nzà nke-anọ we putara Isaka, bú umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di.

18. Ókè-ala-ha we rue Jezreel, na Kesulot, na Shunem;

19. na Hafaraim, na Shion, na Anaharat;

20. na Rabit, na Kishion, na Ebez;

21. na Remet, na En-ganim, na En-hada, na Bet-pazez:

22. ókè-ala ahu we metu Teboa, na Shahazuma, na Bet-shemesh; ọpupu ókè-ala-ha di kwa na Jọdan: obodo iri na isi na obodo ntà ha.

Joshua 19