35. Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hamat, na Rakat, na Kineret;
36. na Adama, na Rema, na Hezoa;
37. na Kedesh, na Edrei, na En-hezoa;
38. na Iron, na Migdal-el, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; obodo iri na iteghete na obodo ntà ha.
39. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha.
40. Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara.
41. Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh;
42. na Shaalabin na Ajalon, na Itla;
43. na Ilon, na Timna, na Ekron;
44. na Elteke, na Gibeton, na Bealat;
45. na Jihud, na Bene-berak, na Gat-rimon;