19. na Hafaraim, na Shion, na Anaharat;
20. na Rabit, na Kishion, na Ebez;
21. na Remet, na En-ganim, na En-hada, na Bet-pazez:
22. ókè-ala ahu we metu Teboa, na Shahazuma, na Bet-shemesh; ọpupu ókè-ala-ha di kwa na Jọdan: obodo iri na isi na obodo ntà ha.
23. Nka bu ihe-nketa ebo umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di, obodo ahu na obodo ntà ha.