14. ókè-ala ahu we b͕a ya buruburu n'Ugwu rue Hanaton: ọpupu-ya di kwa na ndagwurugwu Ifta-el;
15. na Katat, na Nahalal, na Shimron, na Idala, na Bet-lehem: obodo iri na abua na obodo ntà ha.
16. Nka bu ihe-nketa umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.
17. Ife-nzà nke-anọ we putara Isaka, bú umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di.
18. Ókè-ala-ha we rue Jezreel, na Kesulot, na Shunem;
19. na Hafaraim, na Shion, na Anaharat;
20. na Rabit, na Kishion, na Ebez;