15. Akuku Ndida we site na nsọtu Kiriat-jearim, ókè-ala ahu we pua n'akuku Ọdida-anyanwu, pua rue isi-iyi miri Neftoa:
16. ókè-ala ahu we rida rue nsọtu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu nwa Hinom, nke di na ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu; ọ rida rue ndagwurugwu Hinom, rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida, we rida rue En-rogel;
17. ewe kpa ókè-ala ahu n'Ugwu, ọ pua n'En-shemesh, pu kwa rue Gelilot, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim; ọ rida rue nkume Bohan nwa Reuben;
18. ọ gabiga rue akuku na ncherita-iru Araba n'akuku Ugwu, we rida rue Araba:
19. ókè-ala ahu we gabiga rue akuku Bet-họgla n'akuku Ugwu: ọpupu ókè-ala ahu di kwa n'ọnu-miri Ugwu nke Oké Osimiri Nnú, na nsọtu Ndida nke Jọdan; nka bu ókè-ala Ndida.
20. Jọdan bu kwa ókè-ala-ya n'akuku Iru-anyanwu. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu dika ab͕uru nile ha si di.
21. Ma obodo ebo umu Benjamin nwere dika ab͕uru nile ha si di bu Jeriko, na Bet-họgla, na Emek-keziz;
22. na Bet-araba, na Zemaraim, na Bet-el;
23. na Avim, na Para, na Ọfra;
24. na Kefa-amoni, na Ọfni, na Geba; obodo iri na abua na obodo ntà ha:
25. na Gibeon, na Rema, na Beirot;
26. na Mizpeh, na Kefira, na Moza;
27. na Rekem, na Iapeel, na Tarala;
28. na Zela, na Elef, na ndi Jebus (nke ahu bu Jerusalem), na Gibeat, na Kiriat; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin dika ab͕uru nile ha si di.