Joshua 15:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida.

2. Ókè-ala Ndida nke ha nwere we di site na nsọtu Oké Osimiri Nnú, site n'ọnu-miri nke nēche iru na Ndida:

3. o we pua rue akuku Ndida nke nrigo Akrabim, gabiga rue Zin, rigo n'akuku Ndida nke Kedesh-banea, gabiga Hezron, rigorue Ada, b͕a buruburu rue Kaka:

4. o we gabiga rue Azmon, pua na miri-iyi Ijipt; ọpupu ókè-ala ahu we di n'oké osimiri: nka gāburu unu ókè-ala Ndida.

Joshua 15