Joshua 13:13-22 Bible Nso (IGBOB)

13. Ma umu Israel anapughi ndi Geshua na ndi Meakat ala-ha: Geshua na Meakat we biri n'etiti umu Israel, rue ta.

14. Nání ebo Livai ka ọ nēnyeghi ihe-nketa; àjà-ọku nile nke Jehova, bú Chineke Israel, nke ahu bu ihe-nketa-ya, dika Ọ gwara ya okwu.

15. Moses we nye ebo umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di.

16. Ókè-ala ha nwere we di site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke di n'akuku Medeba;

17. Heshbon, na obodo-ya nile nke di n'ala di lari; Dibon, na Bamot-beal, na Bet-beal-meon;

18. na Jehaz, na Kedimot, na Mefaat;

19. na Kiriataim, na Sibma, na Zeret-shaha n'ugwu ndagwurugwu ahu;

20. na Bet-peoa, na nkpọrube nile nke Pisga, na Bet-jeshimot;

21. na obodo nile nke ala di lari, na ala-eze nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, onye Moses tib͕uru, ya na ndi-isi Midian, bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, ndi bu ndi-isi nke Saihon, ndi bi n'ala ahu.

22. Umu Israel were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa, bu onye nāju ase, n'etiti ndi ha b͕uru.

Joshua 13