1. Ma Joshua ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; Jehova we si ya, I ghọwo agadi, ubọchi ndu-gi nāgwu, ma ala nke riri nne nke-uku fọduru inweta.
2. Nka bu ala nke fọduru: buruburu-ala nile nke ndi Filistia, na ndi Geshua nile;
3. site na Shaihoa ahu, nke di n'iru Ijipt, we rue ókè-ala Ekron n'akuku Ugwu, ndi Kenean ka aguru ya nye: ndi-isi ise nke ndi Filistia; ndi Geza, na ndi Ashdod, na ndi Ashkelon, na ndi Gat, na ndi Ekron; ndi Avim kwa,