4. na ókè-ala Og, bú eze Beshan, onye sitere na ndi fọduru nke Refaim, onye bi n'Ashtarot na n'Edrei,
5. nāchi kwa n'ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon.
6. Moses, bú orù Jehova, na umu Israel tib͕uru ha: Moses, bú orù Jehova, we nye ya ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, ka ọ buru ihe-nnweta.
7. Ndia bu kwa eze ala ahu ndi Joshua na umu Israel tib͕uru n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu, site na Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon we rue ugwu Halak, nke nārigo rue Sia; Joshua we nye ya ebo Israel nile ka ọ buru ihe-nnweta dika esi kè ha n'òkè n'òkè;
8. n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na n'Araba ahu, na nime nkpọrube nile, na n'ọzara, na nime Negeb; ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:
9. eze Jeriko, otù; eze Ai, nke di n'akuku Bet-el, otù;
10. eze Jerusalem, otù; eze Hebron, otù:
11. eze Jamut, otù; eze Lekish, otù;