1. Ma ndia bu eze ala ahu, ndi umu Israel tib͕uru, nweta ala-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon, na Araba nile n'akuku ọwuwa-anyanwu:
2. Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, nāchi kwa site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na etiti ndagwurugwu ahu, na nkera Gilead, we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;
3. na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n'akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n'okpuru nkpọrube Pisga: