Joshua 11:7-10 Bible Nso (IGBOB)

7. Joshua we bia, ya na ndi-agha nile, imegide ha n'akuku miri Mirom na mberede, we dakwasi ha.

8. Jehova we nye ha n'aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n'akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha.

9. Joshua we me ha dika Jehova siri ya: o bipuru nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha, sure kwa ub͕ọ-ala nile ha n'ọku.

10. Joshua we laghachi na mb͕e ahu, were Hezoa, were mma-agha tib͕ue eze-ya: n'ihi na Hezoa na mb͕e gara aga bu isi ala-eze ahu nile.

Joshua 11