2. ziga-kwa-ra ndi-eze ndi nọ n'Ugwu, bú n'ugwu, na n'Araba nke di na Ndida Kinerot, na n'ebe di ala ala, na n'ebe nile di elu nke Doa n'Ọdida-anyanwu, ozi;
3. o zigara ndi Kenean n'Ọwuwa-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus n'ugwu, na ndi-Haivait n'okpuru Heamon n'ala Mizpa.
4. Ha we puta, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile tiyere ha, bú ndi bara uba, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba, ha na inyinya na ub͕ọ-ala bara uba nke-uku.
5. Eze ndia nile we zukọ; ha we bia, makọ ulo-ikwū-ha na miri Mirom, ibuso Israel agha.
6. Jehova we si Joshua, Atula egwu n'ihi ha: n'ihi na echi dika na mb͕e a Mu onwem gāra ha nile nye ka ha buru ndi eb͕uru eb͕u n'iru Israel: nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha ka i gēbipu, ọ bu kwa ub͕ọ-ala nile ha ka i gēsure n'ọku.
7. Joshua we bia, ya na ndi-agha nile, imegide ha n'akuku miri Mirom na mberede, we dakwasi ha.
8. Jehova we nye ha n'aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n'akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha.