Joshua 10:30-41 Bible Nso (IGBOB)

30. Jehova we nye kwa ya na eze-ya n'aka Israel; o were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru nime ya; o me eze-ya dika ọ mere eze Jeriko.

31. Joshua we si na Libna gabiga, ya na Israel nile, rue Lekish, ma ulo-ikwū-ya megide ya, buso ya agha:

32. Jehova we nye Lekish n'aka Israel, o were ya n'ubọchi nke-abua, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya, dika ihe nile si di nke o mere Libna.

33. Mb͕e ahu Horam, bú eze Gezea, rigoro iyere Lekish aka; Joshua we tib͕ue ya na ndi-ya, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ọ rapuru ya.

34. Joshua we si na Lekish gabiga, ya na Israel nile, rue Eglon; ha ma ulo-ikwū-ha megide ya, buso ya agha;

35. ha were ya n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, madu nile nke di nime ya ka ọ wezugara ka ebibie ha n'ubọchi ahu, dika ihe nile si di nke o mere Lekish.

36. Joshua we si n'Eglon rigo, ya na Israel nile, rue Hebron; ha buso ya agha:

37. ha were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na eze-ya, na obodo-ya nile, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru, dika ihe nile si di nke o mere Eglon; o wezuga ya ka ebibie ya, na madu nile nke di nime ya.

38. Joshua we laghachi, ya na Israel nile, rue Debia, buso ya agha:

39. o were ya, na eze-ya, na obodo-ya nile; ha were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga madu nile nke di nime ya ka ebibie ha; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: dika o mere Hebron, otú a ka o mere Debia, me kwa eze-ya; dika ọ me-kwa-ra Libna, me kwa eze-ya.

40. Joshua we tib͕ue ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb, na ebe di ala ala, na nkpọrube nile, na eze-ha nile; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o wezuga ihe nile nēku ume ka ebibie ya, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere iwu.

41. Joshua we si na Kedesh-banea tib͕ue ha we rue Geza, na ala Goshen nile, we rue Gibeon.

Joshua 10