28. Joshua we were Makeda n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya na eze-ya; o wezugara ha na madu nile nke di nime ya ka ebibie ha, ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o me eze Makeda dika o mere eze Jeriko.
29. Joshua we si Makeda gabiga, ya na Israel nile, rue Libna, buso Libna agha:
30. Jehova we nye kwa ya na eze-ya n'aka Israel; o were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru nime ya; o me eze-ya dika ọ mere eze Jeriko.
31. Joshua we si na Libna gabiga, ya na Israel nile, rue Lekish, ma ulo-ikwū-ya megide ya, buso ya agha:
32. Jehova we nye Lekish n'aka Israel, o were ya n'ubọchi nke-abua, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya, dika ihe nile si di nke o mere Libna.
33. Mb͕e ahu Horam, bú eze Gezea, rigoro iyere Lekish aka; Joshua we tib͕ue ya na ndi-ya, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ọ rapuru ya.
34. Joshua we si na Lekish gabiga, ya na Israel nile, rue Eglon; ha ma ulo-ikwū-ha megide ya, buso ya agha;
35. ha were ya n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, madu nile nke di nime ya ka ọ wezugara ka ebibie ha n'ubọchi ahu, dika ihe nile si di nke o mere Lekish.
36. Joshua we si n'Eglon rigo, ya na Israel nile, rue Hebron; ha buso ya agha: