Joshua 10:26-38 Bible Nso (IGBOB)

26. Emesia Joshua we tib͕ue ha, me ka ha nwua, kwuba ha n'osisi ise: ha we kwugide n'elu osisi ise ahu rue anyasi.

27. O rue, na mb͕e anyanwu nāda, na Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi ise ahu weda ha, tubà ha n'ọb͕à ahu ebe ha zoro onwe-ha, we tukwasi nkume uku n'ọnu ọb͕à ahu, rue ubọchi nke ta.

28. Joshua we were Makeda n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya na eze-ya; o wezugara ha na madu nile nke di nime ya ka ebibie ha, ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o me eze Makeda dika o mere eze Jeriko.

29. Joshua we si Makeda gabiga, ya na Israel nile, rue Libna, buso Libna agha:

30. Jehova we nye kwa ya na eze-ya n'aka Israel; o were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru nime ya; o me eze-ya dika ọ mere eze Jeriko.

31. Joshua we si na Libna gabiga, ya na Israel nile, rue Lekish, ma ulo-ikwū-ya megide ya, buso ya agha:

32. Jehova we nye Lekish n'aka Israel, o were ya n'ubọchi nke-abua, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya, dika ihe nile si di nke o mere Libna.

33. Mb͕e ahu Horam, bú eze Gezea, rigoro iyere Lekish aka; Joshua we tib͕ue ya na ndi-ya, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ọ rapuru ya.

34. Joshua we si na Lekish gabiga, ya na Israel nile, rue Eglon; ha ma ulo-ikwū-ha megide ya, buso ya agha;

35. ha were ya n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, madu nile nke di nime ya ka ọ wezugara ka ebibie ha n'ubọchi ahu, dika ihe nile si di nke o mere Lekish.

36. Joshua we si n'Eglon rigo, ya na Israel nile, rue Hebron; ha buso ya agha:

37. ha were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na eze-ya, na obodo-ya nile, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru, dika ihe nile si di nke o mere Eglon; o wezuga ya ka ebibie ya, na madu nile nke di nime ya.

38. Joshua we laghachi, ya na Israel nile, rue Debia, buso ya agha:

Joshua 10