Joshua 10:24-32 Bible Nso (IGBOB)

24. O rue, mb͕e ha mere ka eze ise ahu pukute Joshua, na Joshua kpọrọ ndikom nile nke Israel, si ndi-ọchi-agha nke ndikom agha ndi soro ya je, Bianu nso, zọkwasinu ukwu-unu n'olu eze ndia. Ha we bia nso, zọkwasi ukwu-ha n'olu-ha.

25. Joshua we si ha, Unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ; dinu ike, nwe-kwa-nu ume: n'ihi na otú a ka Jehova gēme ndi-iro-unu nile ndi unu onwe-unu nēbuso agha.

26. Emesia Joshua we tib͕ue ha, me ka ha nwua, kwuba ha n'osisi ise: ha we kwugide n'elu osisi ise ahu rue anyasi.

27. O rue, na mb͕e anyanwu nāda, na Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi ise ahu weda ha, tubà ha n'ọb͕à ahu ebe ha zoro onwe-ha, we tukwasi nkume uku n'ọnu ọb͕à ahu, rue ubọchi nke ta.

28. Joshua we were Makeda n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya na eze-ya; o wezugara ha na madu nile nke di nime ya ka ebibie ha, ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o me eze Makeda dika o mere eze Jeriko.

29. Joshua we si Makeda gabiga, ya na Israel nile, rue Libna, buso Libna agha:

30. Jehova we nye kwa ya na eze-ya n'aka Israel; o were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru nime ya; o me eze-ya dika ọ mere eze Jeriko.

31. Joshua we si na Libna gabiga, ya na Israel nile, rue Lekish, ma ulo-ikwū-ya megide ya, buso ya agha:

32. Jehova we nye Lekish n'aka Israel, o were ya n'ubọchi nke-abua, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya, dika ihe nile si di nke o mere Libna.

Joshua 10