Jona 1:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. Ndikom ahu we tua oké egwu, si ya, Gini bu ihe a i meworo? N'ihi na ndikom ahu mara na ọ bu n'iru Jehova ka ọ nēsi b͕alaga, n'ihi na o gosiri ha-ri.

11. Ha we si ya, Gini ka ayi gēme gi, ka oké osimiri we dajua ghara imakwasi ayi? n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu.

12. O we si ha, Bulienum, tubàm n'oké osimiri; oké osimiri ewe dajua ghara imakwasi unu: n'ihi na mu onwem amawo na ọ bu n'ihim ka oké ifufe di uku a nēfekwasi unu.

13. Ma ndikom ahu we nyasie ike inyaghachi ub͕ọ n'ala; ma ha apugh: n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu megide ha.

14. Ha we kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, biko, ekwela ka ayi la n'iyì n'ihi ndu nwoke a, etiyekwasi-kwa-la n'isi ayi ọbara nēmeghi ihe ọjọ: n'ihi na Gi onwe-gi, bú Jehova, emewo dika o si tọ Gi.

15. Ha we bulie Jona, tubà ya n'oké osimiri: oké osimiri we guzo ọb͕ub͕ọ-ya.

16. Ndikom ahu we tua egwu Jehova nke-uku, ha we chuara Jehova àjà, kwe nkwa di iche iche.

17. Jehova we guputa otù azù uku ilo Jona; Jona we nọ n'afọ azù ahu ubọchi atọ ehihie na abali.

Jona 1