15. Unu onwe-unu nēkpe dika anu-aru si di; Mu onwem ekpeghi onye ọ bula.
16. Ma ọ buru na mu onwem ekpe kwa ikpé, ikpém bu ezie; n'ihi na ọ bughi nání Mu nọ, kama ọ bu Mu onwem na Nna Nke ziterem.
17. Ma edewo kwa n'akwukwọ iwu-unu, na àmà nke madu abua bu ezie.
18. Mu onwem bu onye nāb͕ara Onwem àmà, Nna Nke ziterem nāb͕a-kwa-ram àmà.
19. Ya mere ha si Ya, Òle ebe Nna-Gi di? Jisus zara, si, Unu amataghi m, unu amataghi kwa Nnam: ọ buru na unu mataram, unu gāmata-kwa-ri Nnam.
20. Okwu ndia ka O kwuru n'ebe anēdebe ùtú anātu, mb͕e Ọ nēzí ihe n'ulo uku Chineke: ọ dighi kwa onye ọ bula jidere Ya; n'ihi na oge hour Ya akābiarughi.
21. Ya mere Ọ siri ha ọzọ, Mu onwem nāla, unu gāchọkwam, unu gānwu kwa na nmehie-unu: ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia.
22. Ya mere ndi-Ju nāsi, Ò gēb͕u Onwe-ya, na Ọ nāsi, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia?
23. O we si ha, Unu onwe-unu si n'ebe di ala puta; Mu onwem si n'ebe di elu puta: unu onwe-unu si n'uwa nka puta; Mu onwem esighi n'uwa nka puta.
24. Ya mere M'siri unu, na unu gānwu na nmehie nile unu: n'ihi na ọ buru na unu ekweghi na Mu onwem bu Ya, unu gānwu na nmehie nile unu.
25. Ya mere ha nāsi Ya, Gì onwe-gi bu onye? Jisus siri ha, Ọbuná ihe M'nāgwa kwa unu site na mbu.
26. Enwerem ọtutu ihe M'gēkwu nke M'gēkpe kwa bayere unu: ma Onye ziterem bu ezie; ihe Mu onwem nu-kwa-ra n'ọnu Ya, ihe ndia ka M'nāgwa uwa.
27. Ha amaghi na Ọ nāgwa ha okwu bayere Nna-Ya.