Jọn 7:38-43 Bible Nso (IGBOB)

38. Onye nēkwere na Mu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ kwuru, n'afọ-ya ka osimiri nke miri di ndu gēsi nērùputa.

39. Ma nka ka O kwuru bayere Mọ Nsọ, Nke ndi kwere na Ya gaje inara: n'ihi na akēnyeghi Mọ Nsọ; n'ihi na akēnyeghi Jisus otuto.

40. Ya mere ufọdu nime ìgwè madu ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia, ha si, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu.

41. Ndi ọzọ nāsi, Onye a bu Kraist-ayi. Ma ufọdu nāsi, Gini, ọ̀ gābu na Galili ka Kraist-ayi si bia?

42. Àkwukwọ nsọ ekwughi na Kraist-ayi nēsi na nkpuru Devid bia, site kwa na Betlehem, bú obodo ntá ebe Devid nọri?

43. Ya mere nkewa putara n'etiti ìgwè madu ahu n'ihi Ya.

Jọn 7