Jọn 7:12-16 Bible Nso (IGBOB)

12. Oké ntamu di kwa n'etiti ìgwè madu nile bayere Ya: ufọdu nāsi, Ọ bu ezi madu; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama Ọ nēduhie ìgwè madu a.

13. Otú ọ di, ọ dighi onye ọ bula nēkwuwa okwu bayere Ya n'ihi egwu ndi-Ju.

14. Ma mb͕e o ruru n'etiti ememe ahu ub͕u a Jisus rigoro n'ulo uku Chineke, we nēzí ihe.

15. Ya mere o nēju ndi-Ju anya, ha si, Onye a, Ò si aṅa mata akwukwọ ri nne, n'ebe ọ dighi mb͕e Ọ muworo akwukwọ?

16. Ya mere Jisus zara ha, si, Ozizím abughi nkem, kama ọ bu nke Onye ziterem.

Jọn 7