Jọn 6:62-71 Bible Nso (IGBOB)

62. Ùnu agaghi-amakari kwa n'ọnyà ma ọ buru na unu ahu Nwa nke madu ka Ọ nārigo n'ebe Ọ nọri na mbu?

63. Ọ bu Mọ nēme ka madu di ndu; anu-aru abaghi urù ọ bula: okwu nke Mu onwem gwaworo unu, ha bu mọ, buru kwa ndu.

64. Ma ufọdu ndi nēkweghi di n'etiti unu. N'ihi na Jisus mara site na mbu ndi ha bu ndi nēkweghi, na onye ọ bu nke gārara Ya nye.

65. O we si, Ọ bu n'ihi nka ka M'siworo unu, na ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na enyeghi ya site n'aka Nnam.

66. Site na nka ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya we laghachi azu, ha esoghi kwa Ya ejeghari ọzọ.

67. Ya mere Jisus siri ndi-ozi iri na abua ahu, Ùnu onwe-unu nāchọ kwa ila?

68. Saimon Pita zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, Ònye ka ayi gējekuru? I nwere okwu nke ndu ebighi-ebi.

69. Ọzọ, ayi onwe-ayi ekwerewo mara kwa na Gi onwe-gi bu Onye Nsọ ahu nke Chineke.

70. Jisus zara ha, si, Ọ̀ bughi Mu onwem rọputara unu, bú ndi-ozi iri na abua, ma otù onye nime unu bu nwa ekwensu?

71. Ma Ọ nēkwu ihe bayere Judas nwa Saimon Iskariot, n'ihi na onye ahu gaje irara Ya nye, buri otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu.

Jọn 6