29. Jisus zara, si ha, Nka bu ọlu Chineke, ka unu kwere n'Onye ahu Ya onwe-ya zitere.
30. Ya mere ha siri Ya, Gini kwa ka Gi onwe-gi nēme ka ọ buru ihe-iriba-ama, ka ayi we hu, kwere kwa Gi? gini ka I nālu?
31. Nna-ayi-hà riri manna n'ọhia; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Nri nke sitere n'elu-igwe ka O nyere ha ka ha rie.
32. Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ bughi Moses nyere unu nri ahu nke sitere n'elu-igwe; kama ọ bu Nnam nēnye unu ezi nri ahu nke sitere n'elu-igwe.