12. Ma mb͕e afọ juru ha, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Chikọtanu iberibe fọduru, ka ihe ọ bula ghara ila n'iyì.
13. Ya mere ha chikọtara ha, we kpoju nkata iri na abua n'iberibe sitere n'ob͕e achicha barley ise ahu, nke fọduru ndi riworori.
14. Ya mere mb͕e ndi ahu huru ihe-iriba-ama O mere, ha siri, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu nke nābia n'uwa.
15. Ya mere mb͕e Jisus huru na ha gaje ibia idọkpuru Ya n'ike, ka ha we me Ya eze, O wezugara Onwe-ya ọzọ n'ugwu nání Ya onwe-ya.
16. Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya ridara n'oké osimiri;
17. ha we ba n'ub͕ọ, we nāgabiga ofè oké osimiri ọzọ iga ru Kapanaum. Ọchichiri ab͕awo-kwa-ri ub͕u a, Jisus akābiakuteghi kwa ha.
18. Oké osimiri nēbili kwa, n'ihi na oké ifufe nēfe.
19. Ya mere mb͕e ha nyasiri ihe dika orú furlong na ise ma-ọbu orú na iri, ha hu Jisus ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, nābiaru kwa ub͕ọ-ha nso: ha we tua egwu.
20. Ma Ọ siri ha, Ọ bu Mu onwem; unu atula egwu.
21. Ya mere ha chọrọ iwebata Ya nime ub͕ọ-ha: ngwa ngwa ub͕ọ-ha we rue ala ebe ha nāga.
22. N'echi-ya, ìgwè madu ndi guzoro n'ofè ọzọ nke oké osimiri ahu huru na ub͕ọ ntà ọzọ adighi n'ebe ahu, ma-ọbughi otù, hu kwa na Jisus esoghi ndi nēso uzọ-Ya ba n'ub͕ọ-ha, kama na nání ndi nēso uzọ-Ya jere;
23. (otú ọ di, ub͕ọ ntà di iche iche sitere na Taibirias bia rue ebe ahu nso ebe ha riri achicha ahu mb͕e Onye-nwe-ayi kelesiri ekele):