Jọn 5:7-15 Bible Nso (IGBOB)

7. Onye ahu aru nādighi ike zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, enweghm madu, ka ọ tubàm n'ọdọ-miri ntà nka, mb͕e ọ bula akpasuru miri: ma mb͕e mu onwem nọ nābia, onye ọzọ eburum uzọ rida.

8. Jisus si ya, Bilie, chiri ute-gi, nējeghari.

9. Ngwa ngwa ewe me ka aru di nwoke ahu nma, o we chiri ute-ya, we nējeghari.Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi ahu.

10. Ya mere ndi-Ju nāsi onye ahu emere ka aru-ya di ike, Ọ bu ubọchi-izu-ike, o zighi kwa ezi n'iwu ka i chiri ute-gi.

11. Ma ọ zara ha, si, Onye mere ka aru dim nma, onye ahu sirim, Chiri ute-gi, nējeghari.

12. Ha juru ya, si, Ònye bu Madu ahu Nke siri gi, Chiri ute-gi nējeghari?

13. Ma onye ahu emere ka aru di ya ike amataghi Onye ọ bu: n'ihi na Jisus wezugarari Onwe-ya, n'ihi na ìgwè madu di n'ebe ahu.

14. Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus chọputara ya n'ulo uku Chineke, si ya, Le, emewo ka aru di gi nma: emehiela ọzọ, ka ihe jọkariri njọ ghara ime gi.

15. Nwoke ahu jere, gwa ndi-Ju na ọ bu Jisus mereri ka aru di ya nma.

Jọn 5