16. ma Pita nēguzo n'èzí n'ọnu-uzọ. Ya mere onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye onye-isi-nchu-àjà mara, we pua gwa nwanyi nke nēche ọnu-uzọ okwu, we dubata Pita.
17. Ya mere nwa-ab͕ọghọ ahu nke nēche ọnu-uzọ si Pita, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye n'etiti ndi nēso uzọ Nwoke a? Pita si, Abughi m.
18. Ma ndi-orù na ndi nēje ozi guzoro n'ebe ahu, ebe ha funwusiri ọku icheku; n'ihi na oyi nātu; ha nānya kwa ọku: Pita nọ kwa n'etiti ha, nēguzo nānya kwa ọku.
19. Ya mere onye-isi-nchu-àjà juru Jisus ajuju bayere ndi nēso uzọ-Ya, na ajuju bayere ozizí-Ya.
20. Jisus zara ya, si, Mu onwem agwawawo uwa okwu; Mu onwem zíri ihe mb͕e nile n'ulo-nzukọ, na n'ulo uku Chineke, ebe ndi-Ju nile nāb͕akọ; ekwukwaghi m ihe ọ bula na nzuzo.
21. Gini mere i nāju Mu onwem? jua ndi nuworo okwum, ihe M'gwara ha: le, ndia matara ihe nile Mu onwem kwuru.
22. Ma mb͕e O kwusiri okwu ndia, otù onye nime ndi nēje ozi nke nēguzo nso we pia Jisus ihe, si, Ì nāza onye-isi-nchu-àjà otú a?
23. Jisus zara ya, si, Ọ buru na M'kwuru nke-ọjọ, b͕ara ihe ọjọ ahu àmà: ma ọ buru nke-ọma, gini mere i nētim aka?
24. Ya mere Anas zigara Ya n'ab͕u jekuru Kaiafas onye-isi-nchu-àjà.
25. Ma Saimon Pita nēguzo nānya kwa ọku. Ya mere ha siri ya, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya? Onye ahu gọrọ, si, Abughi m.
26. Otù onye nime ndi-orù onye-isi-nchu-àjà, buri onye-ikwu nke onye ahu Pita bipuru nti-ya, si, Mù onwem ahughi gi na Ya n'ubi ahu ab͕ara ogige?
27. Ya mere Pita gọ-kwa-ra ọzọ: ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa.