Jọn 18:15-24 Bible Nso (IGBOB)

15. Saimon Pita we so Jisus, ya na onye ọzọ nke nēso uzọ Jisus. Ma onye ahu nke nēso uzọ Jisus bu onye onye-isi-nchu-aja mara, o we so Jisus ba n'obí onye-isi-nchu-àjà;

16. ma Pita nēguzo n'èzí n'ọnu-uzọ. Ya mere onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye onye-isi-nchu-àjà mara, we pua gwa nwanyi nke nēche ọnu-uzọ okwu, we dubata Pita.

17. Ya mere nwa-ab͕ọghọ ahu nke nēche ọnu-uzọ si Pita, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye n'etiti ndi nēso uzọ Nwoke a? Pita si, Abughi m.

18. Ma ndi-orù na ndi nēje ozi guzoro n'ebe ahu, ebe ha funwusiri ọku icheku; n'ihi na oyi nātu; ha nānya kwa ọku: Pita nọ kwa n'etiti ha, nēguzo nānya kwa ọku.

19. Ya mere onye-isi-nchu-àjà juru Jisus ajuju bayere ndi nēso uzọ-Ya, na ajuju bayere ozizí-Ya.

20. Jisus zara ya, si, Mu onwem agwawawo uwa okwu; Mu onwem zíri ihe mb͕e nile n'ulo-nzukọ, na n'ulo uku Chineke, ebe ndi-Ju nile nāb͕akọ; ekwukwaghi m ihe ọ bula na nzuzo.

21. Gini mere i nāju Mu onwem? jua ndi nuworo okwum, ihe M'gwara ha: le, ndia matara ihe nile Mu onwem kwuru.

22. Ma mb͕e O kwusiri okwu ndia, otù onye nime ndi nēje ozi nke nēguzo nso we pia Jisus ihe, si, Ì nāza onye-isi-nchu-àjà otú a?

23. Jisus zara ya, si, Ọ buru na M'kwuru nke-ọjọ, b͕ara ihe ọjọ ahu àmà: ma ọ buru nke-ọma, gini mere i nētim aka?

24. Ya mere Anas zigara Ya n'ab͕u jekuru Kaiafas onye-isi-nchu-àjà.

Jọn 18