40. O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili;Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta,Ghara kwa ichighari,Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.
41. Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n'ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu-kwa-ra okwu bayere Ya.
42. Otú ọ di, ọbuná site n'etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n'ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n'ulo-nzukọ:
43. n'ihi na ha huru otuto madu n'anya kari otuto Chineke.